Jeremiah 8

1“ ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, nʼoge ahụ a ga-esi nʼili ha wezuga ọkpụkpụ ndị eze, na ọkpụkpụ ndịisi ọchịchị Juda, na ọkpụkpụ ndị nchụaja na ndị amụma, na ọkpụkpụ ndị niile bi na Jerusalem. 2A ga-agbasapụ ha nye anyanwụ, na ọnwa, na kpakpando niile nke mbara eluigwe, bụ ihe ndị ahụ niile ha hụrụ nʼanya na ihe ha na-akpọ isiala nye. Bụkwa ihe ndị ahụ ha na-agbaso, nke ha na-ajụta ase site nʼaka ha, na-efekwa. A gaghị ekpokọta ọkpụkpụ ndị a niile, maọbụ lie ha nʼala. Kama ha ga-aghasara nʼala dịka unyi. 3Nʼebe niile nke m chụsara ha, bụ ndị fọdụrụ ndụ site na mba ọjọọ a, ha ga-ahọrọ ọnwụ karịa ịdị ndụ. Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.’

Mmehie na ahụhụ

4“Ị ga-asịkwa ha, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru:

“ ‘Mgbe mmadụ dara ada, ọ dịghị ebili ọtọ?
Mgbe mmadụ daghachiri azụ, ha ọ dịghị alaghachi azụ?
5Gịnịkwa mere ndị a ji tụgharịa site nʼịgbaso ụzọ ọjọọ ha?
Gịnị mere Jerusalem ji nọgide na-agbaso ụzọ ọjọọ?
Lee, ha na-ejidesi aghụghọ aka ike;
ha jụrụ ịtụgharị.
6Aṅaala m ntị,
ma anụbeghị m ka ihe ọma ọbụla si ha nʼọnụ na-apụta.
O nweghị onye nʼime ha chegharịrị tie aka nʼobi sị,
“Gịnị bụ ihe a m mere?”
Kama onye ọbụla na-agbaso ụzọ nke aka ya,
dịka ịnyịnya nke na-agbaba nʼọgbọ agha.
7Ọ bụladị ụgbala na-efegharị na mbara eluigwe
maara oge ya a kara aka.
Nduru, na eleke, na okwolo
makwaara mgbe ha kwesiri isite nʼotu ebe obibi ha gafee nʼebe obibi ọzọ.
Ma ndị m amaghị
ihe Onyenwe anyị chọrọ site nʼaka ha.

8“ ‘Unu si aṅaa kwuo, “Ndị maara ihe ka anyị bụ,
nʼihi na iwu Onyenwe anyị dị nʼaka anyị,”
ebe ọ bụ na mkpisi akwụkwọ aghụghọ ndị ode akwụkwọ unu
adịghị akọwa iwu ya otu o kwesiri?
9A ga-eme ka ihere mee ndị maara ihe;
a ga-eme ka ụjọ jupụta ha obi, meekwa ka ha maa nʼọnya.
Ebe ọ bụ na ha ajụla okwu Onyenwe anyị,
ọ bụ ụdị amamihe dị aṅaa ka ha nwere?
10Ya mere, aga m akpọnye ndị ikom ọzọ nwunye ha,
werekwa ubi ha nyefee nʼaka ndị ọrụ ubi ọzọ.
Nʼihi na site nʼonye ukwu ruo nʼonye dịkarịsịrị nta,
ọ bụ naanị akpịrị uru na-ezighị ezi ka e ji mara ha.
Ọ bụladị ndị amụma na ndị nchụaja
na-etinyekwa aka nʼọrụ aghụghọ.
11Ha na-ekechi ọnya ndị m
dịka a ga-asị na ọ dịghị ihe ọ bụ.
Ha na-asị, “Udo dị, udo dị,”
mgbe udo na-adịghị.
12Ihere o mere ha nʼihi omume arụ ha niile?
Mba! Ihere adịghị eme ha ma ọlị;
nʼezie, ha amakwaghị ihe a na-akpọ inwe ihere.
Nʼihi ya, ha ga-ada nʼetiti ndị dara ada;
ha ga-asọ ngọngọ mgbe e nyere ha ntaramahụhụ.
Otu a ka Onyenwe anyị kwuru.

13“ ‘Aga m anapụ ha ihe owuwe ubi niile ha nwetara,
otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Ha agaghị enwekwa mkpụrụ vaịnị,
maọbụ mkpụrụ osisi fiig nʼelu osisi fiig ha.
Akwụkwọ osisi ndị a niile ga-akpọnwụ.
A ga-anapụkwa ha
ihe niile m nyere ha.’ ”

14Gịnị ka unu na-eme nʼebe a unu nọdụrụ ala?
Kwakọtaanụ ihe unu niile.
Ngwa, ka anyị gbapụnụ ọsọ gaa nʼobodo ndị ahụ niile e wusiri ike
nọdụ nʼebe ahụ nwụọ!
Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke anyị amaala anyị ikpe ọnwụ.
O nyela anyị mmiri e tinyere nsi ka anyị ṅụọ,
nʼihi na anyị emehiela megide ya.
15Anyị lere anya udo,
ma o nweghị ihe ọma ọbụla anyị hụrụ.
Anyị lere anya ọgwụgwọ ọrịa anyị,
maọbụ naanị ihe egwu ka anyị hụrụ.
16E sitere na Dan
nụ ụda ịma imi ịnyịnya ndị iro.
Ala a niile mara jijiji
mgbe ha nụrụ akwa nke ịnyịnya ndị ahụ dị ike.
Ha na-abịa ịla ala a na ihe niile dị nʼime ya nʼiyi.
Ọ bụkwa otu ihe ahụ ka ha
na-abịa ime obodo a na ndị bi nʼime ya.

17“Lee, ana m ezibata agwọ ọjọọ, ndị na-atagbu atagbu, nʼetiti unu.
Ajụala nke ọ dịkwaghị ụra ga-arata ha.
Ihe pụrụ ime na ha agaghị ata unu

Ana m ezibata ha ka ha taa unu.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

18Ọ ga-adị mma ma ọ bụrụ na m hụrụ onye ga-akasị m obi nʼime ọnọdụ iru ụjụ m,
nʼihi na obi m na-ada mba nʼime m.
Maọbụ, Unu ndị na-akasị m obi nʼime ọnọdụ iru ụjụ m, obi m na-ada mba nʼime m.

19Gee ntị nụrụ akwa ndị m
ka ọ na-ada site nʼebe dị anya.
“Onyenwe anyị, ọ sitela na Zayọn pụọ?
Ọ pụtara na Eze ha anọkwaghị nʼebe ahụ?”

“Gịnị mere ha ji site nʼoyiyi a tụrụ atụ,
na arụsị ndị mba ọzọ ha na-efe kpasuo m iwe?”

20“Oge owuwe ihe ubi agafeela,
leekwa na ọkọchị agabigakwala,
ma a zọpụtabeghị anyị.”

21Ebe ọ bụ na a zọpịara ndị m, ọ bụkwa m ka azọpịara.
Anam eru ụjụ, oke egwu jisikwara m aka ike.
22Ọ pụtara na o nweghị mmanụ otite na-eme ka ọnya laa dị na Gilead?
Ọ bụ na e nwekwaghị dibịa nọ nʼebe ahụ?
Gịnị mere o nweghị ọgwụgwọ dịrị ndị m
nʼihi mmerụ ahụ ha niile?
Copyright information for IboBIU